Queens College Yaba: Gịnị na-eme ụmụakwụkwọ ha ọzọ?

Queens College Yaba: Gịnị na-eme ụmụakwụkwọ ha ọzọ?

Ọtụtụ ụmụakwụkwọ esila n’ụlọakwụkwọ obibi na Queens College laa bee ha ịnata ọgwụgwụ maka ọrịa.

Ụlọọrụ ntaakụkọ dị icheiche enyela ọnụọgụgụ ndị lara site na 700 rue 1000 mana amabeghị nke bụ eziokwu.

Otu nne nwere nwa n’ụlọakwụkọ ahụ achọghị ka enye ha ya kwuru na ụmụ ya ka nọ n’ụlọakwụkwọ

“Ụmụ m na-eme ọfụma, onye na-elekọta ha gwara m ya n’ekwentị” ka o kwuru.

Ọ gwakwara BBC Igbo na ọ nụrụ na ọtụtụ ụmụakwụkwọ alaala bee ha mana ọ maghị aha ọrịa ha na-arịa.

Otu onye ntaakụkọ BBC nọ n’ụlọakwụkwọ ahụ na-agbalị ịchọpụta nke bụ eziokwu maka okwu a.

Cheta na ụmụakwụkwọ atọ nwụrụ n’afọ 2017 na Queens College maka mmiri ọjọọ ha ṅụrụ.

Share this post