Lee ihe akụ ọnatarachi juputara n’Abia state

Lee ihe akụ ọnatarachi juputara n’Abia state

Mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjiria niile juputara n’ihe akụ ọnatarachi nke nwere ike ime ka steeti niile dị na ya baa ọgaranya ma ọ bụrụ na-emezie ha nke ọma.

Nke a ga-eme ka gọọmentị steeti ndị dị n’ala Igbo kwụsị ibe akwa ego kwa mgbe kwa mgbe.

Ka anyị lee Abia Steeti na ihe ndị Chineke ji gọzie ha nke nwere ike ịmịtara ha ego ma e lebaa ha anya.

1. Mmanụ Agbidi (Crude Oil)

Abịa so na steeti nwere mmanụ agbidi nakwa ikuku gas na Naịjiria.

Ebe mmanụ agbidi dị n’Abia steeti gụnyere okpuru ọchịchị dị na ọwụwa anyanwu nakwa ọdịda anyanwụ Ụkwa (Ukwa east and west).

E nwere ụmị mmanụ agbidi n’ebe ndị a: Imo River, Obuzo, OwazaNgboko, Nkali, Odogkwa nakwa Isimiri

2. Iron Ore
‘Iron ore’ bụ akụrụngwa dị n’ala nke e ji emepụta igwe na ihe ndị ọzọ.

Ihe dị ka rọọdụ e ji arụ ụlọ nakwa igwe e ji arụ akwa mmiri nke Bekee kpọrọ ‘steel’ bụ ‘iron ore’ ka e ji emepụta ha.

‘Iron ore’ bara ụba n’okpuru ọchịchị Isikwuatọ.

3. Laterite

Nke a juputara n’ala Abia steeti niile.

‘Laterite’ bụ ihe na-adị n’ime aja ụpa nke na-acha mmeemmee.

E ji ‘laterite’ arụ ihe dị icheiche dịka ụzọ nakwa akụrụngwa ndịọzọ e ji arụ ụlọ.

4. Shale na Limestone

Shale bụ ọkpụrụkpụ nkume nke sị na aja ụpa were pụta.

Limestone bụkwa nkume ọcha e ji arụpụta ihe dị icheiche

E ji ‘shale’ akpụ ihe ọkpụkpụ jirikwa ya emepụta nke Bekee kpọrọ ’tiles’ nakwa ‘bricks’.

Agwakọọ ‘shale’ na ‘limestone’, a na-eji ya emepụta ‘cement’.

‘Shale na Limestone’ bara ụba na mpaghara Bende, Isikwuato, Ohafia nakwa Arochukwu.

5. Black Marble

‘Black Marble’ bụ okwute ojii na-egbuke egbuke.

Ọ na-ada oke ọnụahịa ma bụrụkwa ihe mara mma iji dozie ụlọ.

Ị gaa n’Osisioma Ngwa na Ugwunabo, ebe ahụ ka e nwere ‘black marble’ nke ọma.

6. Glass sand
Nke a bụ aja e ji emepụta ‘glass’ dịka enyo, ugegbe, dịrị gawazie.

A na-ewere aja a sie ya n’ọkụ o we gbazee dịka mmiri tupu ewerezie ya mepụta ‘glass’.

Aja ndị a bara ụba na mpaghara Ukwa east na west.

A ga-ahụkwa ya na mpaghara Isiala Ngwa North na South, nakwa Aba North na South.

7. Salt

Na mpaghara Bende ka e nwere nnu n’uju.

Uru nnu bara dị ọtụtụ, ọbụghị naanị maka iji ya esi nri.

E jikwa nnu emepụta ncha, jirikwa ya eme nke bekee kpọrọ ‘dyeing’ nakwa ‘bleaching’.

Nnu na-enyekwa aka n’ịkpụ ihe ọkpụkpụ.

E nwekwara nnu nke mmadụ enweghị ike iri eri.

8. Bentonite Clay
Nke a bụkwa ụdị aja na-adị nro n’aka ma makwaa mma.

Ọ na-enye aka idozi anụ ahụ nke mere na e ji ya arụpụta ihe ndị e ji achọ mma .

Na mpaghara Umuahia na Umuahia South ka e nwere ‘Bentonite Clay’ n’uju.

9. Kaolin

‘Kaolin’ bụ ụdị nkume e nwere ike iji mepụta ihe Bekee kpọrọ ‘Ceramics’.

E jikwa ‘Kaolin’ arụ ọgwụ nwere ike ịkwụsi otoro maọbụ afọ ọsịsa.

Ị ga-ahụ Kaolin n’Ikwuano, Umuahia, nakwa n’ebe ụfọdụ na Isikwuato.

10. Gypsum
Gypsum bụ ihe e ji arụpụta nzu bekee a kpọrọ ‘chalk’.

E jikwa ya arụ ọgwụ nakwa ‘Plaster of Paris’ (POP).

Lokpaukwu bụ mpaghara e nwere ‘Gypsum’ n’ụba.

Matakwa na Abia steeti bụkwa obodo e ji ịkọpụta nri mara, nke bụ na elezie ya anya, ịkọ nri nwere ike ime ka steeti a baa oke ọgaranya.

Ọzọkwa bụ na Abịa nwere ihe ga-amasị ndị na-eme njem nlereanya.

Ebe dịka ‘National War Museum nke dị n’Umuahia, ebe e nwere Ojukwu bọnka, nakwa ọtụtụ ọgba (caves) dị n’Arochukwu nakwa Amakama.

Ọ dịzi n’aka ndị ọchịchị Abia steeti ileba anya n’ihe ndị a iji hụ na nkụ dị na steeti ahụ ga-eghere ha nri.

Share this post