Ihe ndị nwere ọtụ na amụ na-agabiga

Ihe ndị nwere ọtụ na amụ na-agabiga

Mgbe ọbụla ị nụrụ na mmadụ abụghị nwoke ọ bụghị nwaanyị, Kedụ ihe na-agba gị n’uche?

Nke a bụ akụkọ banyere ndị Naịjirịa abụọ James Johnson na Mystique Evolving bu ikpu na amụ pụta ụwa.

Mmadụ abụọ ndị a kọrọ akụkọ ha nakwa ihe ndị ha na-agabiga na ndụ n’ihi ọnọdụ a.

James Johnson

James Johnson bu ọtụ na amụ mgba a mụrụ ya mana nne na nna ya kpebiri na ọ bụ nwaanyị ma gụọ ya aha Iyabo Abade.

Iyabo hapụrụ otu egwuregwu ụmụnwaanyị mgbe ọ chọpụtara oke ihe dị iche ya na ụmụnwaanyị ndị ọzọ.

James amaghị na ọ pụrụiche rue afọ 1997-1998 mgbe a chọrọ ịgba asọmpi Iko mba Afrịka nakwa Iko Mbaụwa nke ụmụnwaanyị.

Dịka obere nwa, Iyabo malitere ịgba bọọlụ mgbe ọ dị afọ iri.

Ọ dị afọ iri na itoolu mgbe ọ chọpụtara oke ndịiche dị n’etiti ya na ụmụnwaanyị ndị ọzọ. James sị na o chere na “ọ bụghị mmadụ” maka na o nwere ọtụ na amụ.

Site na nyocha ndị o mere, ọ chọpụtara na ọ bụ nwoke pasentị iri asaa (70%) na nwaanyị pasenti iri atọ (30%). Nke mere o ji họrọ ịbụ nwoke.

Mystique Evolving

Site na mgbe a mụrụ Mystique o nwere amụ gosiri na ọ bụ nwoke.

Mana dịka ọ na-etolite, olu ya agbanweghi ka nke nwoke, anụ ahụ ya dị nro ka nke nwaanyị.

Ezinaụlọ Mystique na-ebo ya ebubo na ọ na-enwe mmeko nwoke na nwoke.

Ụdị dịka nke nwaanyị. N’ụlọakwụkwọ Sekọndịrị, ezinaụlọ ya na-ebo ya ebubo na ọ bụ onye na-enwe “mmeko nwoke na nwoke”.

N’agbanyeghi nke a Mystique sị “Amara m na ọ bụghị onye mbụ.”

Dịka ọ na-eto, ọ malitere ịkpụ ara dịka nwaanyị. Ọ chọpụtara na akụkọ afọ na-ara ya ahụ kwa ọnwa ọbụla.

Mgbe ọ gara ụlọọgwụ, nnyocha gosiri na o nwere akpụ (ovary) abụọ n’ime ahụ ya mana o nweghi akpa nwa.

Dọkịnta gwara ya na afọ ahụ na-ara ya ahụ kwa ọnwa bụ oge nsọ nwaanyị nke na ọ na-aghị ahụ.

James echefuola ihe niile banyere mgbe ọ bụ Iyabo ewepu ụfọdụ foto

Mystique sị na ezinaụlọ ya niile gbahapụrụ ya n’ime afọ iri ewepụ otu nwanne ya nwoke.

Ihe ndị a na-agabiga

Oke nsogbu ndị nwere ọtụ na amụ na-enwe na Naịjirịa bụ ịkpaoke site n’aka ezinaụlọ ha nakwa ndị obodo.

Ọtụtụ ndụ Naịjirịa amaghị ụdị ihe a, ụfọdụ na-ahụta ha dịka amoosu chọrọ nnapụta maọbụ nke e kwesịrị ịtụgbu n’okwute. Ndị ọzọ na-ahụta ha dịka ndị a bụrụ ọnụ.

Nke a mere ọtụtụ n’ime ha ji ezo ezo n’ihi ụjọ amaghị etu ndị obodo ga-esi akpasa ha agwa.

“N’oge ikpeazụ m hụrụ ndị ezinaụlọ m, ha kara egbu m.”| Ha kụrụ m ihe, kpụọ m isi, gbatuo m n’ala,” Ihe o kwuru.

A bịa na nke James, ezinaụlọ ya hụrụ ya kwadoro. Mana ịkpaoke ọ hụrụ n’egwuregwu bọọlụ mgbe ọ ghọrọ nwoke mere o ji kwụsị ịgba bọọlụ na Naịjirịa.

Ihe bụ ‘ịntersex’?

‘Intersex’ bụ onye nwere ọtụ nwaanyị na amụ nwoke pụta ụwa mgbe a mụrụ ya.

Ọtụtụ n’ime ha na-enwe mgbagwoju anya ma ha ọ bụ nwoke ka ọ bụ nwaanyị.

Ọ na-ara ahụ ịkwọwa ma ụdị a dịka nwoke ma ọ bụ nwaanyị maka ha abụghị otu n’ime ndị a.

Ndị a bu ọtụ na amụ nọ na Naịjirịa dịka ha nọ na mba ndị ọzọ dị n’ụwa. Mana mba ndị mara na ha dị ma nabata ha na-akpọ ha ‘non-binary’. Nke pụtara na ha abụghị nwoke maọbụ nwaanyị.

Ndị ọkacha sị na otu n’ime mmadụ puku abụọ na-alọta ụwa bụ onye nwere ọtụ na amụ (Intersex).

Mana ọ rara ahụ ị mata ole ha dị na Naịjirịa dịka ọtụtụ n’ime ha na-ezo onwe ha ezo.

Share this post